Ihe anyị hụrụ n'ezịnụlọ mmadụ asaa nwụrụ dịka ha richara 'suya na yogọt'

Ihe anyị hụrụ n'ezịnụlọ mmadụ asaa nwụrụ dịka ha richara 'suya na yogọt'
akwamozu mmadụ atọ nwụụ site a suya

E meela mmemme akwamozu ezinaụlọ mmadụ atọ n'ime ha nwụrụ dịka ha tachara suya n'Ụmụeze na Ụmụahịa n'obodo ha bụ Amadike Akanu Item n'okpuruọchịchị Bende nke Abịa Steeti.

Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịara n'uju ịbịa tie nwunye nwoke ahụ ya na ụmụ ya abụọ nwụrụ na ndị ezinaụlọ ha aka n'obi.

N'ụka ikpeazụ nke Rev. Chinedu Ariwa nke ụka 'Assemblies of God Church' kara, o kwuru na ọnwụ bụ ụgwọ nke mmadụ niile ga-ezute.

Nwada Nnenna Esonu, bụ onye sị na ya bụ nwanne Maazị Sunday Okechukwu Ogba nwụrụ anwụ, gwara BBC Igbo na nwa amadi ahụ bụ onye na-agba mbọ dịka onye ọrụ 'electrician' tupu ọnwụ egbuo ya.

Akwamozu mmadụ atọ nwụrụ site n'iri suya

Esonu, onye kwuru na ihe mere ụbọchị ahụ ka na-atụ ezinaụlọ ha n'anya kọwara na nwoke ahụ nwụrụ dịka ya na ezinaụlọ ya na otu enyi bịara ịnọnyere ezinaụlọ ahụ n'oge ezumike richara suya ma ṅụọ mmanya ọtọbịrịbịrị 'fruit juice.'

Ezinaụlọ Chigozirim, Eberechi na Sunday Okechukwu Ogba

Ebe foto si, Sunday Ogba family

Nwunye Maazị Sunday gbara akaebe n'ezie na o nweghị ihe ọzọ ezinaụlọ ahụ riri karịa suya na mmanya di ya jiri lọta ụbọchị ahụ n'abalị 25 nke ọnwa Ọgọstụ ma kwuo na ihe mere ụbọchị ọjọọ ahụ ka na-adị ya ka nrọ.

Ihe anyị hụrụ n'ezinụlọ mmadụ asaa nwụrụ dịka ha richara 'suya na yogọt'

ụlọ

Chikezirim Darlington bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị na Ụmụahịa agwaala BBC Igbo etu e siri bute ozu asaa si otu ezinaụlọ bịa na ya bụ ụlọọgwụ n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde Ọgụstụ 26.

Ọ sị na ebu ụzọ bute otu nwata ahụ adịghị tupu eburuzia ozu mmadụ asaa si ezinaụlọ ya bịa.

Dịka o siri kọwa, a gwara ha na ọ bụ anụ na mmiri ara ehi a na-akpọ yogọt ka ha riri kpatara ọdachi a, mana ọ sịkwa na ha agaghị ekwu hoohaa na ọ bụ ya gburu ha.

Dịka o kwuru na e kwesiri ime nnyocha iji chopụta nke bụ eziokwu.

Nwanne nwoke ihe a mere na be ya bụ Abel gwara BBC Igbo na ọ n'elu oche ọ nọ na-ekwuru TV ka nwanne ya bụ Sunday Okechukwu nọ nwụọ dịka ya na ezinaụlọ ya richara nri.

Abel sị na ya bụ onye ọrụ nchekwa na ihe a mere gbagwojuru ya anya mana ha na-eche mpụtara nnyocha banyere ihe a mere ijiri mara nke bu eziokwu.

Kiri onyonyo ka ịmata ihe ndị a kwuru n'uju.